Categories
JENESIS

JENESIS 1

1 Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.

2 Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n’efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n’elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n’elu miri.

3 Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di.

4 Chineke we hu ìhè ahu, na ọ di nma: Chineke we kpa ókè n’etiti ìhè ahu na ọchichiri ahu.

5 Chineke we kpọ ìhè ahu Ehihie, ọchichiri ahu ka Ọ kpọkwara Abali. Anyasi we di, ututu we di, buru otù ubọchi.

6 Chineke we si, Ka mbara di n’ab͕ata miri ahu, ka ọ nọ kwa nākpa ókè n’etiti miri na miri.

7 Chineke we me mbara ahu, kpa ókè n’etiti miri ahu nke di n’okpuru mbara ahu na miri ahu nke di n’elu mbara ahu: ọ we di otú a.

8 Chineke we kpọ mbara ahu Elu-igwe. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-abua.

9 Chineke we si, Miri ahu nke di n’okpuru elu-igwe, ka achikọta ha n’otù ebe, ka ahú kwa ala-akọrọ: ọ we di otú a.

10 Chineke we kpọ ala-akọrọ ahu Ala; nchikọta miri ahu ka Ọ kpọkwara Oké Osimiri: Chineke we hu na ọ di nma.

11 Chineke we si, Ka ala puputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha, osisi mkpuru nke nāmi mkpuru di iche iche, nke mkpuru-ọghi-gha-ya di nime ya, n’elu ala: o we di otú a.

12 Ala we weputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha di iche iche, ya na osisi nke nāmi mkpuru di iche iche, nke nkpuru-ọghigha-ya di nime ya: Chineke we hu na ọ di nma.

13 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-atọ.

14 Chineke we si, Ka ihe nke nēnye ihè di na mbara elu-igwe ikpa ókè n’etiti ehihie na abali; ka ha buru kwa ihe igosi ihe-iriba-ama di iche iche, na igu mb͕e akara àkà, na igu ubọchi na arọ:

15 ka ha buru kwa ihe nēnye ìhè nime mbara elu-igwe inye ìhè n’elu uwa: o we di otú a.

16 Chineke we kpua ihe uku abua ahu nke nēnye ìhè; Ọ kpuru ihe ahu nēnye ìhè nke ka uku ka ọ nāchi ehihie, na ihe ahu nēnye ìhè nke ka ntà ka ọ nāchi abali: Ọ kpukwara kpakpando nile,

17 Chineke we tinye ha nime mbara elu-igwe inye ìhè n’elu uwa,

18 na ichi ehihie na ichi abali, na ikpa ókè n’etiti ìhè na ọchichiri: Chineke we hu na ọ di nma.

19 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-anọ.

20 Chineke we si, Ka miri nuputa ihe nēnuputa enuputa, bú anu nwere nkpuru-obi di ndu, ka anu-ufe feghari kwa n’elu uwa n’iru mbara elu-igwe.

21 Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.

22 Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n’oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n’uwa.

23 Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-ise.

24 Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a.

25 Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n’ala: Chineke we hu na ọ di nma.

26 Chineke we si, Ka ayi kpua madu n’onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n’aru azù nke oké osimiri, na n’aru anu-ufe nke elu-igwe, na n’aru anu-ulo, na n’aru uwa nile, na n’aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n’elu uwa.

27 Chineke we kè madu n’onyinyo-Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.

28 Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n’okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n’aru azù nke oké osimiri, na n’aru anu-ufe nke elu-igwe, na n’aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n’elu uwa.

29 Chineke we si, Le, enyewom unu ihe-ọkukú nile ọ bula nāmiputa nkpuru-ọghigha, nke di n’elu uwa nile, na osisi nile ọ bula, nke nkpuru osisi nāmiputa nkpuru-ọghigha di nime ya; unu ka ọ diri ibu ihe-oriri:

30 o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M’nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n’elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a.

31 Chineke we hu ihe nile ọ bula O mere, ma, le, ọ di nma nke-uku. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-isi.

Categories
JENESIS

JENESIS 2

1 Ewe kesia elu-igwe na uwa, na usu-ha nile.

2 Chineke we jesia ozi-Ya n’ubọchi nke-asa, bú nke O jere; O we kwusi n’ubọchi nke-asa ahu n’ozi-Ya nile nke O jere.

3 Chineke we gọzie ubọchi nke-asa ahu, do kwa ya nsọ: n’ihi na ọ bu nime ya ka Ọ kwusiri n’ozi-Ya nile nke Chineke kereri ekè n’ije ya.

4 Ndia bu usoro okike elu-igwe na uwa mb͕e ekere ha, n’ubọchi ahu mb͕e Jehova, bú Chineke, mere uwa na elu-igwe.

5 Ma osisi ntà ọ bula nke ọhia akādighi n’uwa, ihe-ọkukú ọ bula nke ọhia akēpughi kwa: n’ihi na Jehova, bú Chineke, akēmeghi ka miri zo n’elu uwa, ọ dighi kwa madu di ilu ọlu ubi;

6 ma alulu nēsi n’ala kwugo n’elu, nēdè kwa iru nile nke ala miri.

7 Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n’ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n’oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.

8 Jehova, bú Chineke, we kua ubi nke ab͕ara ogige n’Iden, n’Iru-anyanwu; O we tinye madu ahu n’ebe ahu, bú onye Ọ kpururi.

9 Jehova, bú Chineke, we me ka osisi nile ọ bula si n’ala pue, bú nke anāchọsi ike n’ile anya, nke di kwa nma ihe-oriri; osisi nke ndu dikwa n’etiti ubi ahu ab͕ara ogige, na osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọ.

10 Osimiri nēsi kwa n’Iden puta idè ubi ahu ab͕ara ogige miri; ewe site n’ebe ahu kewa ya, ọ we ghọ isi miri anọ.

11 Aha osimiri nke-mbu bu Paishon: nke ahu bu nke nāga ala Havila nile gburugburu, ebe ọla-edo di;

12 ọla-edo ala ahu di nma: n’ebe ahu ka bdellium na nkume onyx di.

13 Aha osimiri nke-abua bu Gaihon: nke ahu bu nke nāga ala Etiopia nile buruburu.

14 Aha osimiri nke-atọ bu Hidekel: nke ahu bu nke nāga Asiria n’Iru-anyanwu. Osimiri nke-anọ bu Yufretis.

15 Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n’ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya.

16 Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n’osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri:

17 ma nkpuru nke sitere n’osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n’ihi na n’ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.

18 Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M’gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya.

19 Jehova, bú Chineke, we site n’ala kpu anu-ọhia nile ọ bula, na anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; O we me ka ha biakute madu ahu, ihu ihe ọ gākpọ ha: ma aha ọ bula madu ahu nākpọ anu nwere nkpuru-obi di ndu, nke ahu bu aha-ya.

20 Madu ahu we kpọ anu-ulo nile na anu-ufe nke elu-igwe na anu-ọhia nile ọ bula aha; ma madu, ahughi onye-iye-aka kwesiri ya.

21 Jehova, bú Chineke, we me ka oké ura dakwasi madu ahu, o we raru ura; O we weputa otù nime ọgiriga-ya, mechie anu-aru n’ọnọdu-ya:

22 ọgiriga ahu, bú nke O weputara n’aru madu ahu, Jehova, bú Chineke, we wue ya dika ulo ka ọ ghọ nwanyi, O me ka ọ biakute madu ahu.

23 Madu ahu we si, Ehe! nka bu nọ ọkpukpu si n’ọkpukpum puta, na anu-aru si n’anu-arum puta: nka ka agākpọ Nwayi, n’ihi na eweputara nka n’aru Nwoke.

24 N’ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n’aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru.

25 Ha abua we buru ndi b͕a ọtọ, nwoke ahu na nwunye-ya, ma ihere adighi-eme ha.

Categories
JENESIS

JENESIS 3

1 Ma agwọ di aghughọ kari anu ọhia ọ bula nke Jehova, bú Chineke, mereri. O we si nwayi ahu, Ọ̀ gābu ezie na Chineke siri, Unu erila nkpuru sitere n’osisi ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige?

2 Nwayi we si agwọ ahu, Ayi nēri nkpuru osisi nile nke ubi a ab͕ara ogige:

3 ma nkpuru nke osisi ahu nke di n’etiti ubi a ab͕ara ogige, Chineke asiwo, Unu erila nkpuru sitere na ya, unu emetukwala ya aka, ka unu we ghara inwu anwu.

4 Agwọ we si nwayi, Ọ dighi ọnwu unu nāghaghi inwu:

5 n’ihi na Chineke mara na n’ubọchi unu gēri nkpuru sitere na ya, mb͕e ahu ka agēmeghe anya-unu, unu ewe di ka Chineke, nāma ezi ihe na ihe ọjọ.

6 Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.

7 Ewe meghe anya ha abua, ha we mara na ndi b͕a ọto ka ha bu; ha we dukọta akwukwọ osisi fig, mere onwe-ha ihe-ọkiké.

8 Ha we nu olu Jehova, bú Chineke, ka Ọ nējeghari n’ubi ahu ab͕ara ogige mb͕e ifufe nēfe n’ubọchi: madu ahu na nwunye-ya we zopu onwe-ha n’iru Jehova, bú Chineke, n’etiti osisi nke ubi ahu ab͕ara ogige.

9 Jehova, bú Chineke, we kpọ madu ahu òkù, si ya, Òle ebe i nọ?

10 O we si, Anurum olu-Gi n’ubi a ab͕ara ogige, m’we tua egwu, n’ihi na onye b͕a ọtọ ka m’bu; m’we zo onwem.

11 O we si, Ònye gosiri gi na onye b͕a ọtọ ka i bu? Ì riwo nkpuru sitere n’osisi ahu, nke M’nyere gi iwu bayere ya, ka i ghara iri nkpuru sitere na ya?

12 Madu ahu we si, Nwayi ahu nke I nyerem ka mu na ya biri, ya onwe-ya nyerem nkpuru sitere n’osisi ahu, m’we rie.

13 Jehova, bú Chineke, we si nwayi ahu, Gini bu nka i meworo? Nwayi we si, Agwọ ahu rafurum, m’we rie.

14 Jehova, bú Chineke, we si agwọ ahu, N’ihi na i mewo nka, ihe anābu ọnu ka i bu kari anu-ulo nile, na kari anu ọhia nile ọ bula; afọ-gi ka i gēji je ije, ọ bu kwa ájá ka i ganēri ubọchi nile nke ndu-gi:

15 iro ka M’gētiye kwa n’etiti gi na nwayi ahu, na n’etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n’isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n’ikiri-ukwu.

16 Nwayi ahu ka Ọ siri, M’gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n’ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n’ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi.

17 Adam ka Ọ sikwara, N’ihi na i gewo nti n’olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n’osisi ahu, nke M’nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n’ihi gi; n’ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi;

18 o bu kwa ogwu na uke ka ọ gēpuru gi; i gēri kwa ihe-ọkukú nke ubi;

19 n’ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n’ala; n’ihi na esiri na ya weputa gi; n’ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.

20 Madu ahu we kpọ aha nwunye-ya Iv; n’ihi na nwayi ahu bu nne madu nile nwere ndu.

21 Jehova, bú Chineke, we were akpukpọ anu mere Adam, mekwara nwunye-ya, uwe-ime, we yibe ha.

22 Jehova, bú Chineke, we si, Le, madu ahu aghọwo ihe di ka otù onye nime ayi, n’ima ezi ihe na ihe ọjọ; ma ub͕u a, ka o we ghara iseti aka-ya, were nkpuru sitere n’osisi ahu nke ndu, rie, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi:

23 Jehova, bú Chineke, we zipu ya n’ubi Iden ab͕ara ogige, ilu ọlu ala ahu nke esiri na ya weputa ya.

24 O we chupu madu ahu, me ka Cherubim nọdu n’akuku Iru-anyanwu nke ubi Iden ab͕ara ogige, ha na ire-ọku nke mma-agha nke nēchighari onwe-ya, ichebe uzọ osisi ahu nke ndu.

Categories
JENESIS

JENESIS 4

1 Madu ahu we mara aru Iv, bú nwunye-ya; o we turu ime, mua Ken, si, Enwetawom nwoke site n’iye-aka Jehova.

2 Ọzọ kwa, ọ mua nwa-nṅe-ya nwoke, bú Ebel. Ebel we buru onye nāzù ìgwè ewu na aturu, ma Ken bu onye nālu ọlu ubi.

3 O rue, n’ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova.

4 Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma:

5 ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua.

6 Jehova we si Ken, N’ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n’ihi gini ka iru-gi b͕aruru?

7 Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n’ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n’ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya.

8 Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n’ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n’ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya.

9 Jehova we si Ken, Òle ebe Ebel, bú nwa-nne-gi, nọ? Ọ we si, Amaghm: ọ̀ bu onye-nche nwa-nnem ka m’bu?

10 Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n’ala.

11 Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n’ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n’aka-gi;

12 mb͕e i nālu ọlu ubi, ọ gaghi-enye gi ike-ya ọzọ; onye nāṅaghari na ọsọ ka i gābu n’uwa.

13 Ken we si Jehova, Ahuhu ajọ omumem di uku kari obubu.

14 Le, I chupuwom ta n’iru ala; ọ bu kwa n’iru-Gi ka agēzopum; m’gābu kwa onye nāṅaghari na ọsọ n’uwa; o gēru kwa na onye ọ bula nke nāhum gēb͕um.

15 Jehova we si ya, N’ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n’aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya.

16 Ken we si n’iru Jehova pua, biri n’ala Nod, n’Iru-anyanwu Iden.

17 Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok.

18 Ewe mua Irad nye Inok: Irad we mua Mehujael: Mehujael we mua Metushael: Metushael we mua Lemek.

19 Lemek we lutara onwe-ya ndinyom abua: aha otù onye nime ha bu Eda, aha nwayi ibe-ya bu Zila.

20 Eda we mua Jebel: onye ahu bu nna ndi bi n’ulo-ikwū, ndi nwe-kwa-ra anu-ulo.

21 Aha nwa-nne-ya nwoke bu Jubal: onye ahu bu nna ndi nile nākpọ ubọ-akwara, nēb͕u kwa ọ̀jà.

22 Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama.

23 Lemek we si ndinyom-ya:

Eda na Zila, nurunu olum;

Ndinyom Lemek, genu nti n’okwu-ọnum:

N’ihi na nwoke ka m’b͕uworo n’ihi ob͕ub͕u-mmam,

Ọ bu kwa nwata-nwoke ka m’b͕uworo n’ihi ubiri-utarim:

24 Asi na ọ bu okpukpu asa ka agābọ̀ Ken ọ́bọ̀,

Agābọ kwa Lemek ọgu okpukpu atọ na iri na asa.

25 Adam we mara aru nwunye-ya ọzọ; nwunye-ya we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Set, si, N’ihi na Chineke doworom nkpuru ọzọ n’ọnọdu Ebel; n’ihi na Ken b͕uru ya.

26 Set kwa, ya onwe-ya ka amu-kwa-ra nwa-nwoke nye; ọ kpọ aha-ya Enosh: mb͕e ahu ka amalitere ikpọku aha Jehova.

Categories
JENESIS

JENESIS 5

1 Nka bu akwukwọ osuso-ọmumu nile nke Adam. N’ubọchi Chineke kere madu, n’oyiyi Chineke ka O mere ya;

2 nwoke na nwayi ka O kere ha; Ọ gọzie ha, kpọ aha-ha Madu, n’ubọchi ekere ha.

3 Adam we di ndu ọgu arọ isi na iri, ọ mua nwa n’oyiyi-ya, dika onyinyo-ya si di; ọ kpọ aha-ya Set:

4 ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

5 Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua.

6 Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh:

7 Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

8 ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.

9 Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan:

10 Enosh di ndu, mb͕e ọ musiri Kenan, nnù arọ abua na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

11 ubọchi nile nke Enosh we buru nnù arọ abua na ọgu ise na ise: o we nwua.

12 Kenan di ndu ọgu arọ atọ na iri, ọ mua Mahalalel:

13 Kenan di ndu, mb͕e ọ musiri Mahalalel, nnù arọ abua na ọgu abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

14 ubọchi nile nke Kenan we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri: o we nwua.

15 Mahalalel di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Jered:

16 Mahalalel di ndu, mb͕e ọ musiri Jered, nnù arọ abua na oru na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

17 ubọchi nile nke Mahalalel we buru nnù arọ abua na ọgu anọ na iri na ise: o we nwua.

18 Jered di ndu ọgu arọ asatọ na abua, ọ mua Inok:

19 Jered di ndu, mb͕e ọ musiri Inok, nnù arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

20 ubọchi nile nke Jered we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na abua: o we nwua.

21 Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela:

22 Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

23 ubọchi nile nke Inok we buru ọgu arọ iri-na-asatọ na arọ ise:

24 Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n’ihi na Chineke kuru ya la.

25 Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek:

26 Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

27 ubọchi nile nke Metusela we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na iteghete: o we nwua.

28 Lemek di ndu ọgu arọ iteghete na abua, ọ mua nwa-nwoke:

29 ọ kpọ aha-ya Noa, si, Onye a gākasi ayi obi banyere ọlu-ayi, banyekwara ndọb͕u ayi ji aka-ayi adọb͕u onwe-ayi n’ọlu, bú nke putara n’ala Jehova buworo ọnu.

30 Lemek di ndu, mb͕e ọ musiri Noa, nnù arọ na ọgu iteghete na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

31 ubọchi nile nke Lemek we buru nnù arọ na ọgu iri-na-asatọ na arọ iri na asa: o we nwua.

32 Noa we b͕a nnù arọ na ọgu ise: Noa we mua Shem, na Ham, na Jefet.

Categories
JENESIS

JENESIS 6

1 O rue, mb͕e madu malitere iba uba n’elu ala, mb͕e amukwara umu-ndinyóm nye ha,

2 na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara.

3 Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n’ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi.

4 Nefilim nọ n’uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.

5 Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n’uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile.

6 Jehova we chegharia na O mere madu n’uwa, ọ we wute Ya n’obi-Ya.

7 Jehova we si, M’gēkpochapu madu n’elu ala, bú ndi M’keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n’ihi na echeghariwom na emerem ha.

8 Ma Noa hutara amara n’iru Jehova.

9 Ndia bu osuso-ọmumu Noa. Noa bu onye ezi omume, onye zuru okè n’ọb͕ọ-ya nile: Noa na Chineke yikọrọ nējeghari.

10 Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet.

11 Ma ebibiri uwa n’iru Chineke, uwa juputakwara n’ihe-ike.

12 Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n’ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n’elu uwa.

13 Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n’irum; n’ihi na uwa juputara n’ihe-ike site na ha; ma, le, M’gēbibi ha na uwa.

14 Mere onwe-gi ub͕ọ nke osisi gopher; ulo-nwubi di iche iche ka i gēme n’ub͕ọ ahu, were kwa bitumen techie ya ime na azu.

15 Nka bu kwa otú i gēme ya: ọgú cubit iri-na-ise ka ogologo ub͕ọ ahu bu, ọgu cubit abua na iri bu obosara-ya, orú cubit na iri bu idi-elu-ya.

16 Oghere inye ìhè ka i gēmere ub͕ọ ahu, rue otù cubit ka i gēmesi kwa ya site n’elu; ọnu-uzọ ub͕ọ ahu ka i gētiye kwa n’akuku-ya; okpukpu nke-ala na nke-abua na nke-atọ ka i gēme ya.

17 Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n’okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n’uwa gēkubi ume.

18 Ma M’gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n’ebe i nọ; i gābata kwa n’ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi.

19 Ọ bu kwa ufọdu nime anu nile ọ bula nke di ndu, nime anu-aru nile, abua abua n’aha nile ọ bula, ka i gēme ka ha bata n’ub͕ọ, idebe ha ndu tiyere onwe-gi; oke na nwunye ka ha gābu.

20 Nime anu-ufe di iche iche, na nime anu-ulo di iche iche, nime ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu n’ala, abua abua n’aha nile ọ bula gābiakute gi, idebe ha ndu.

21 Gi onwe-gi kwa, were n’onwe-gi ufọdu nime ihe-oriri nile nke anēri eri, gi chikọta ya n’ebe i nọ; ọ gāburu gi, bukwara ha, ihe-oriri.

22 Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.

Categories
JENESIS

JENESIS 7

1 Jehova we si Noa, Ba n’ub͕ọ ahu, gi onwe-gi na ulo-gi nile; n’ihi na gi ka M’huworo bu onye ezi omume n’irum n’ọb͕ọ a.

2 Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n’anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya;

3 ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n’elu uwa nile.

4 N’ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n’uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M’gēkpochapu kwa n’elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M’meworo.

5 Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.

6 Noa b͕ara nnù arọ na ọgu iri mb͕e iju-miri ahu di n’elu uwa.

7 Noa we si n’iru miri nke iju-miri ahu ba n’ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom.

8 Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n’elu ala,

9 abua abua bakuru Noa n’ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu.

10 O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n’elu uwa.

11 N’arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n’ọnwa nke-abua, n’ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n’ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe.

12 Oké miri-ozuzo ahu we di n’elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

13 N’otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n’ub͕ọ ahu;

14 ha onwe-ha, na anu-ọhia nile ọ bula di iche iche, na anu-ulo nile ọ bula di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nākpu akpu nke nākpu akpu n’elu uwa, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche, aha nnunu nile ọ bula.

15 Ha we bakuru Noa n’ub͕ọ ahu, abua abua nime anu-aru nile nke ume nke ndu di nime ya.

16 Ndi nāba n’ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n’anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime.

17 Iju-miri ahu we di n’elu uwa ọgu ubọchi abua; miri ahu we ba uba, bulie ub͕ọ ahu, ewe si n’elu uwa bulie ya elu.

18 Miri ahu di ike, ba uba nke-uku n’elu uwa; ub͕ọ ahu we nāgaghari n’elu miri.

19 Miri ahu di ike nke-uku n’elu uwa; ewe kpuchie ugwu nile di elu nke di n’okpuru elu-igwe nile.

20 Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n’elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile.

21 Anu-aru nile nke nākpu akpu n’elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n’elu uwa, na madu nile ọ bula:

22 ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n’oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n’ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu.

23 O we kpochapu ihe nile ọ bula di ndu nke di n’elu ala, ma madu, ma anumanu, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: ewe kpochapu ha n’uwa: ọ we fọdu nání Noa na ndi ya na ha nọ n’ub͕ọ ahu.

24 Miri we di ike n’elu uwa ọgu ubọchi asa na iri.

Categories
JENESIS

JENESIS 8

1 Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n’ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n’elu uwa, miri we taba;

2 e mechikwara isi-iyi nile nke ob͕u-miri na window nile nke elu-igwe, eb͕ochi-kwa-ra oké miri-ozuzo nēsite n’elu-igwe;

3 miri we si n’elu uwa nālaghachi mb͕e nile: miri ahu we bilata mb͕e ọgu ubọchi asa na iri gwusiri.

4 Ub͕ọ ahu we tọb͕ọrọ n’elu ugwu nke Ararat n’ọnwa nke-asa, n’ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa ahu.

5 Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n’ọnwa nke-iri ahu, n’ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu.

6 O rue, mb͕e ọgu ubọchi abua gwusiri, na Noa meghere window nke ub͕ọ o mere:

7 o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n’elu uwa.

8 Ọ we si n’ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n’elu ala taba;

9 ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n’ub͕ọ, n’ihi na miri ahu di n’elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ.

10 Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ; ọ we si n’ub͕ọ zipu nduru ahu ọzọ;

11 nduru ahu we bakute ya na mb͕e anyasi; ma, le, akwukwọ osisi olive akubitere ọhu di n’ọnu-ya: Noa we mara na miri esiwo n’elu uwa taba.

12 Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ, zipu nduru ahu; ma ọ laghachikuteghi ya ọzọ ma-ọli.

13 O rue, n’arọ nke-nnù na ọgu iri na otù, n’ọnwa mbu, n’ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na miri siri n’elu uwa tasia: Noa we wezuga ihe-nkpuchi nke ub͕ọ ahu, hu, ma, le, iru ala kpọrọ nku.

14 Ọ bu n’ọnwa nke-abua, n’ubọchi nke-orú-na-asa, ka ala kọsiri.

15 Chineke we gwa Noa okwu, si,

16 Si n’ub͕ọ pua, gi onwe-gi, na nwunye-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi.

17 Anu nile ọ bula nke di ndu nke gi na ya nọ, bú nke sitere n’anu-aru nile, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime ihe nile nākpu akpu nke nākpu akpu n’uwa, gi me ka ha so gi puta; ka ha we nuputa n’uwa, mua ọmùmù, ba uba n’elu uwa.

18 Noa we pua, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom:

19 anu nile ọ bula nke di ndu, ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, na anu-ufe nile ọ bula, ihe ọ bula nke nākpu akpu n’elu uwa, dika ab͕uru-ha si di, ha siri n’ub͕ọ pua.

20 Noa we wuere Jehova ebe-ichu-aja, were ufọdu nime anu-ulo nile ọ bula di ọcha na nime anu-ufe nile ọ bula di ọcha, sure àjà-nsure-ọku n’ebe-ichu-aja ahu.

21 Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M’gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n’ihi madu, n’ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M’gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M’meworo.

22 Rue ubọchi nile nke uwa, ọghigha-nkpuru na owuwe-ihe-ubi, na oyi na okpom-ọku, na udumiri na ọkọchi, na ehihie na abali, agaghi-ebì.

Categories
JENESIS

JENESIS 9

1 Chineke we gọzie Noa na umu-ya ndikom, si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa.

2 Egwù-unu na ujọ-unu gādikwasi n’anu nile ọ bula nke uwa nke di ndu, na n’anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; tiyere ihe nile ọ bula nke ala nēnuputa, tiye-kwa-ra azù nile nke oké osimiri, n’aka-unu ka enyeworo ha.

3 Ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, nke di ndu, gāburu unu ihe-oriri; dika akwukwọ ihe-ọkukú ka M’nyeworo unu ha nile.

4 Nání anu-aru nke ndu-ya, bú ọbara-ya, di nime ya ka unu nāgaghi-eri.

5 N’ezie ọbara-unu, bú nke diri ndu-unu, ka M’gajuta kwa; n’aka anu nile ọ bula di ndu ka M’gājuta ya: ọ bu kwa n’aka madu, n’aka nwa-nne madu ọ bula, ka M’gājuta ndu madu.

6 Onye nāwusi ọbara madu, site n’aka madu ka agāwusi ọbara-ya: n’ihi na ọ bu n’onyinyo Chineke ka O mere madu.

7 Unu onwe-unu kwa, muanu ọmùmù, banu uba; nuputanu umu n’uwa, ba uba nime ya.

8 Chineke we gwa Noa, gwa kwa umu-ya ndikom tiyere ya, okwu, si,

9 Mu onwem kwa, le, M’ganēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n’ebe unu nọ, na n’ebe nkpuru-unu nọ, bú ndi gānọchi unu;

10 na n’ebe anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu di nke dinyere unu, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia nile ọ bula nke uwa nke dinyere unu; bú nke sitere n’ihe nile nēsi n’ub͕ọ ahu puta, bú anu-ọhia nile ọ bula nke uwa.

11 M’gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n’ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa.

12 Chineke we si, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Mu onwem nāb͕a n’etiti Mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke diyere unu, rue ọb͕ọ nile ebighi-ebi:

13 eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n’igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n’etiti Mu na uwa.

14 Ọ gēru kwa, mb͕e M’nēme ka igwe-oji puta n’elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n’igwe-oji ahu,

15 M’we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n’etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile.

16 Eke-na-ogwurugwu ahu gādi kwa n’igwe-oji; M’gāhu kwa ya anya, icheta ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi di n’etiti Chineke na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile nke di n’elu uwa.

17 Chineke we si Noa, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọbub͕a-ndu ahu nke M’meworo ka o guzosie ike n’etiti Mu na anu-aru nile nke di n’elu uwa.

18 Umu-ndikom Noa, ndi siri n’ub͕ọ ahu pua, bu Shem, na Ham, na Jefet: ma Ham bu nna Kenean.

19 Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara.

20 Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine:

21 ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n’etiti ulo-ikwū-ya.

22 Ham, bú nna Kenean, we hu ọtọ nna-ya, gosi umu-nne-ya ndikom abua n’èzí.

23 Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n’ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n’azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha.

24 Noa we teta n’ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya.

25 Ọ we si,

Onye anābu ọnu ka Kenean bu;

Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom.

26 Ọ si kwa,

Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu;

Ka Kenean ghọkwara ha orù.

27 Ka Chineke me ka Jefet setia,

Ya biri kwa n’ulo-ikwū nile nke Shem;

Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù.

28 Noa we di ndu, mb͕e iju-miri ahu gasiri, ọgu arọ iri-na-asa na arọ iri.

29 Ubọchi nile nke Noa we buru nnù arọ abua na ọgu asa na iri: o we nwua.

Categories
JENESIS

JENESIS 10

1 Ma ndia bu osuso-ọmumu umu-ndikom Noa, bú Shem na Ham na Jefet: amukwara ha umu-ndikom, mb͕e iju-miri ahu gasiri.

2 Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras.

3 Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Rifat, na Togama.

4 Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim.

5 Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n’ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.

6 Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.

7 Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.

8 Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n’uwa.

9 Ya onwe-ya bu dike n’ichu-ntá n’iru Jehova: n’ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n’ichu-ntá n’iru Jehova.

10 Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n’ala Shaina.

11 O siri n’ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala,

12 na Resen n’etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu).

13 Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim,

14 na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.

15 Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het;

16 na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;

17 na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin;

18 na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa.

19 Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha.

20 Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n’ala nile ha, nime mba nile ha.

21 Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet.

22 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.

23 Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash.

24 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.

25 Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n’ihi na ọ bu n’ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.

26 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;

27 na Hadoram, na Uzal, na Dikla;

28 na Obal, na Abimael, na Sheba;

29 na Ofia, na Havila, na Jobab: ndia nile bu umu-ndikom Jọktan.

30 Ebe-obibi-ha we buru site na Misha, mb͕e i nēje Sefa, ugwu nke Iru-anyanwu.

31 Ndia bu umu-ndikom Shem, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n’ala nile ha, dika mba nile ha si di.

32 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Noa, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nime mba nile ha: site kwa na ndia ka ekesara mba nile n’uwa, mb͕e iju-miri ahu gasiri.